1Mgbe ahụ Josef nyere odibo nọ nʼụlọ ya iwu sị, “Gbajuo akpa ndị ikom ndị a nri. Tinyere ha nri nke onye ọbụla nʼime ha nwere ike ibu, tinyekwa ego nke onye ọbụla nʼime ha kwụrụ nʼọnụ akpa ya.
2Ma tinye iko ọlaọcha m nʼime ọnụ akpa onye nke nta nʼime ha. Tinyekwa ego ọ kwụrụ nʼihi nri ọ zụrụ nʼime akpa ya.” Odibo a mere dịka Josef gwara ya.
3Mgbe chi bọrọ, ha zipụrụ ndị ikom ndị a, ha na ịnyịnya ibu ha.