23Ma ị gwara ndị ohu gị sị, ‘Unu agaghị ahụ ihu m anya ọzọ, ma ọ bụrụ na nwanne unu a esoghị unu gbadata.’
24Mgbe anyị lakwuuru ohu gị bụ nna anyị, anyị gwara ya okwu onyenwe m kwuru.
25“Mgbe nna anyị gwara anyị sị, ‘Laghachi gaa zụta nri,’
26anyị gwara ya na, ‘Anyị agaghị agbada ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta agaghị eso anyị. Nʼihi na anyị enweghị ike ịhụ nwoke ahụ anya, ma ọ bụrụ na nwanne anyị nta esoghị anyị.’
27“Oge ahụ, ohu gị bụ nna anyị sịrị anyị, ‘Unu maara na nwunye m mụụrụ m ụmụ nwoke abụọ.