32Biko, onyenwe m, eji m ndụ m zọọrọ nna m ebe na m ga-elezi nwantakịrị a anya. Asị m ya, ‘Ọ bụrụ na m akpọghachighị nwantakịrị a nye gị, ka ịta ụta bụrụ nke m nʼihu gị bụ nna m nʼụbọchị niile nke ndu m.’
33“Ya mere ugbu a, biko, ka ohu gị nọdụ dịka ohu onyenwe m nʼọnọdụ nwantakịrị a, ka nwantakịrị a soro ụmụnne ya laghachikwuru nna anyị.
34Aga m esi aṅaa laghachikwuru nna m ma ọ bụrụ na mụ na nwantakịrị a esoghị? Enweghị m ike ilekwasị ihe ọjọọ ga-adakwasị nna m anya.”