4Mgbe ha ji naanị ihe nta gafee obodo ahụ, Josef gwara odibo ya sị, “Bilie, chụso ndị ikom ndị ahụ ọsọ. I zute ha, sị ha, ‘Gịnị mere unu ji were ihe ọjọọ kwụghachi ihe ọma?
5Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nna m ukwu, iko o ji aṅụ ihe ọṅụṅụ na nke o ji ajụ ase? Unu emeela ihe ọjọọ nʼihi ihe a unu mere.’ ”
6Mgbe odibo ahụ zutere ha, ọ gwara ha ihe ndị a.
7Ma ha zara sị ya, “Nna anyị ukwu, gịnị mere i ji ekwu ụdị okwu ndị a? Ihe arụ ka ọ bụ anyị ime ihe dị otu a.
8Lee, ego anyị chọtara nʼọnụ akpa anyị ka anyị sitere nʼala Kenan weghachi. Olee otu anyị ga-esi zuru ọlaedo maọbụ ọlaọcha site nʼụlọ nna gị ukwu?