Jenesis 49

Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.

Genesis 49:30 (UKJV) In the cave that is in the field of Machpelah, which is before Mamre, in the land of Canaan, which Abraham bought with the field of Ephron the Hittite for a possession of a buryingplace.

28Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.

29Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het.

30Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu.

31Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa.

32Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.