Jenesis 49

“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.

Genesis 49:8 (UKJV) Judah, you are he whom your brethren shall praise: your hand shall be in the neck of yours enemies; your father's children shall bow down before you.

6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.

7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.

8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.

9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?

10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.