12Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.
13Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
15Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.
16Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.