1Josef dakwasịrị nʼihu nna ya, kwaa akwa, sutukwa ya ọnụ.
2Josef nyere iwu, ka ndị dibịa na-ejere ya ozi gbasie ozu nna ya. Ya mere, ndị dibịa ahụ gbasikwara Izrel.
3O were ha iri ụbọchị anọ ịgbasi ozu, nʼihi na nke a bụ oge o kwesiri iwe ha ime ya. Mgbe nke a gasịrị, a kwara ya nʼala Ijipt iri ụbọchị asaa.