Jenesis 50

Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?”

Genesis 50:15 (UKJV) And when Joseph's brethren saw that their father was dead, they said, Joseph will possibly hate us, and will certainly requite us all the evil which we did unto him.

13Nʼihi na ha buuru ozu ya laa nʼala Kenan, lie ya nʼọgba ahụ dị nʼọhịa Makipela, nke bụ ala ubi Ebraham zụrụ dịka ala olili ozu, site nʼaka Efrọn, onye Het; nʼakụkụ Mamre.

14Emesịa, Josef laghachiri Ijipt ya na ụmụnne ya, na ndị niile sooro ya gaa olili ozu nna ya, ngwangwa elichara nna ya.

15Mgbe ụmụnne Josef hụrụ na nna ha anwụọla, ha sịrị, “Eleghị anya Josef ga-akpọ anyị asị, kwụghachi anyị ụgwọ ihe ọjọọ niile anyị mere ya?”

16Nʼihi nke a, ha zipụrụ Josef ozi sị, “Nna gị nyere iwu a tupu ọ nwụọ.

17‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.