23Josef hụrụ ụmụ Ifrem, na ụmụ ụmụ ya. Ọ nọkwa ndụ hụ ụmụ Makia nwa Manase, ndị e kukwasịrị nʼikpere ya.
24Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Agala m ịnwụ, ma Chineke ga-abịa ileta unu. Ọ ga-esi nʼala a kpọpụta unu kpọgakwa unu nʼala ahụ ọ ṅụụrụ Ebraham na Aịzik na Jekọb iyi, na ọ ga-enye ha.”
25Mgbe ahụ, Josef mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi sị, “Mgbe Chineke bịara ileta unu, unu aghaghị ị site nʼebe a chịkọrọ ọkpụkpụ m.”
26Josef nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri. Ha gbasiri ozu ya, tinye ya nʼime igbe ozu, nʼala Ijipt.