4Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
5Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
6Noa gbara narị afọ isii mgbe mmiri ukwu a bidoro izo nʼelu ụwa.
7Noa banyere nʼụgbọ mmiri ahụ, ya na ụmụ ya ndị ikom na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya ndị ikom ịgbanarị uju mmiri ahụ.
8Ụmụ anụmanụ ndị dị ọcha, na ndị na-adịghị ọcha, abụọ abụọ, tinyere anụ ufe na ihe niile e kere eke na-akpụgharị nʼala, abụọ abụọ kwa,