Jenesis 9

na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa.

Genesis 9:10 (UKJV) And with every living creature that is with you, of the fowl, of the cattle, and of every beast of the earth with you; from all that go out of the ark, to every beast of the earth.

8Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị,

9“Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu,

10na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa.

11Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.”

12Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.