22Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ.
23Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya.
24Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere,
25o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.”
26Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem.