8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
9Ha niile na-abịa ime ihe ike. Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.
10Ha na-akwa ndị eze emo, jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị. Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị, na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.
11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.