15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.
16Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, na-erikwa nri kachasị mma
17Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?