Habakuk 1

Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.

Habakkuk 1:3 (UKJV) Why do you show me iniquity, and cause me to behold grievance? for spoiling and violence are before me: and there are that raise up strife and contention.

1Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.

2Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu ma ị dịghị ege ntị? Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” ma ị dịghị azọpụta?

3Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? Gịnị mere i ji anagide mmegbu? Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.

4Nʼihi ya, iwu na-ada mba, ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.

5“Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.