5“Legide mba niile anya, ka i hụ. Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, nke unu na-agaghị ekwenye, ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.
6Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.
7Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu. Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme. Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.
8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.
9Ha niile na-abịa ime ihe ike. Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.