4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ.
5Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.
6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’
7Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ.
8Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche, ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ, i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha.