12I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.
13Ị pụtara ịzọpụta ndị gị, ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ. Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ, gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ.
14Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi, mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị, mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala, bụ ndị na-ezo onwe ha.
15Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
16Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.