Hegai 1

Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”

Haggai 1:11 (UKJV) And I called for a drought upon the land, and upon the mountains, and upon the corn, and upon the new wine, and upon the oil, and upon that which the ground brings forth, and upon men, and upon cattle, and upon all the labour of the hands.

9“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.

10Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi.

11Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”

12Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị.

13Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.