Hegai 2

“Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.

Haggai 2:21 (UKJV) Speak to Zerubbabel, governor of Judah, saying, I will shake the heavens and the earth;

19Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a. “ ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’ ”

20Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị,

21“Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.

22Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya.

23“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.