5‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’
6“Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.
7Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
8‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
9‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”