11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
12Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
13O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị, “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
14Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?