Ndị Hibru 10

ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,

Hebrews 10:21 (UKJV) And having an high priest over the house of God;

19Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,

20bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya,

21ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,

22ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.

23Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.