23Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
24Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.
25Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
26Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile.
27Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.