27Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
28Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya.
29Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe?
30Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”
31Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ.