36Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa.
37Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.”
38Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.”
39Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.