Ndị Hibru 11

O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka.

Hebrews 11:28 (UKJV) Through faith he kept the passover, and the sprinkling of blood, lest he that destroyed the firstborn should touch them.

26O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu.

27Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.

28O sitekwara nʼokwukwe debe Mmemme Ngabiga. O fesara ọbara ka onye mbibi nke ụmụ nwoke mbụ, hapụ ịmetụ ụmụ nwoke mbụ ndị Izrel aka.

29Ha gafere Osimiri Uhie site nʼokwukwe dị ka a ga-asị na ọ bụ ala efu. Ma mgbe ndị Ijipt nwara ime nke a, mmiri lomiri ha niile.

30Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.