Ndị Hibru 11

Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya.

Hebrews 11:3 (UKJV) Through faith we understand that the worlds were framed by the word of God, so that things which are seen were not made of things which do appear.

1Ugbu a, okwukwe bụ inwe obi ike banyere ihe ndị a na-ele anya ha na inwe owuweanya banyere ihe a na-ahụbeghị anya.

2Nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka e ji gbaara ndị ochie ama.

3Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya.

4Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe.

5E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.