30Mgbidi Jeriko dara mgbe ha jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa.
31Site nʼokwukwe, Rehab nwanyị akwụna esoghị ndị nnupu isi laa nʼiyi nʼihi na ọ nabatara ndị bịara inyochapụta obodo ahụ nʼudo.
32Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, na Barak, na Samsin, na Jefta, na Devid, na Samuel na ndị amụma,
33ndị sitere nʼokwukwe merie ọtụtụ alaeze, kpeekwa ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, ndị mechiri ọnụ ọdụm.
34Ha menyụrụ ọkụ dị egwu, gbanarị mma agha, nweta ike site nʼadịghị ike. Ha ghọkwara ndị dị ike nʼagha, chụlaa usuu ndị agha ndị mba ọzọ.