Ndị Hibru 12

Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.

Hebrews 12:10 (UKJV) For they verily for a few days chastened us after their own pleasure; but he for our profit, that we might be partakers of his holiness.

8Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko.

9Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.

10Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya.

11Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.

12Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.