17Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.
18Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe,
19na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha.
20Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.”
21Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”