Ndị Hibru 12

Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”

Hebrews 12:6 (UKJV) For whom the Lord loves he chastens, and scourges every son whom he receives.

4Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu.

5Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ, “Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.

6Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”

7Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.

8Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.