Ndị Hibru 13

Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.

Hebrews 13:2 (UKJV) Be not forgetful to entertain strangers: for thereby some have entertained angels unexpectedly.

1Ka ịhụnanya unu nwere nʼetiti unu na-adịgide.

2Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.

3Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.

4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.