23Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nʼụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nʼebe a na mgbe na-adịghị anya.
24Keleerenụ m ndịisi unu niile na ndị nsọ niile. Ndị si Itali na-ezitere unu ekele ha.
25Ka amara dịnyere unu niile.