4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.