15Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
16Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham.
17Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.
18Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.