15Dị ka e kwuru ya, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya. Unu emela ka obi unu sie ike, dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
16Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt?
17Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara?
18Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi?
19Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.