3Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru.
4Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile.
5Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu.
6Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,