Ndị Hibru 4

Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

Hebrews 4:12 (UKJV) For the word of God is active, and powerful, and sharper than any two-edged sword, piercing even to the dividing asunder of soul and spirit, and of the joints and marrow, and is a discerner of the thoughts and intents of the heart.

10Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.

11Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.

12Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

13Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.

14Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.