Ndị Hibru 4

Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.

Hebrews 4:16 (UKJV) Let us therefore come boldly unto the throne of grace, that we may obtain mercy, and find grace to help in time of need.

14Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.

15Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.

16Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.