1Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya.
2Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.
3Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa.
4Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.”
5Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.”