1Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,
2na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi.
3Anyị ga-eme nke a ma Chineke kwe.