6ma mesịa dahie nʼonwe ha, ọ bụ ihe siri ike ịkpọghachite ha ruo nchegharị. Ha na akpọgidekwa Ọkpara Chineke nʼobe ọzọ, na emenyekwa ya ihere nʼihu ọha mmadụ.
7Nʼihi na ala ahụ nke na-amị mmiri na-ezokwasị nʼelu ya mgbe niile, na-amịpụta mkpụrụ bara ụba nye ndị e ji maka ha kọọ ya, na-enweta ngọzị nʼaka Chineke.
8Ma ọ bụrụ na o puo naanị ogwu na ahịhịa, ọ baghị uru ọbụla. Kama, ọ ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, nke ọgwụgwụ ya ga-abụ ịkpọ ya ọkụ.
9Ma ọ bụ ezie na anyị na-ekwu otu a, ezi ndị enyi m, anyị nwere ntụkwasị obi maka ihe dị ezi mma banyere unu, bụ ihe ndị ha na nzọpụta so bịa.
10Chineke abụghị onye na-ekpe ikpe nʼezighị ezi. Ọ gaghị echefu ọrụ niile unu rụrụ ya. Ọ gaghị echefu ịhụnanya niile unu gosiri nʼihi ya site nʼịgara ndị nsọ ozi, dịka unu na-aga nʼihu na-emekwa.