Ndị Hibru 9

Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke,

Hebrews 9:11 (UKJV) But Christ being come an high priest of good things to come, by a greater and more perfect tabernacle, not made with hands, that is to say, not of this building;

9Nke a bụ ihe ilu banyere oge ugbu a. Site na nhazi nke a, onyinye na aja niile a na-achụ enweghị ike ime ka akọnuche onye na-efe ofufe zuo oke.

10Kama ha bụ naanị usoro iwu metụtara ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ụdị baptizim dị iche iche nke anụ ahụ, bụ nke e nyere ka a na-eme ya ruo mgbe a ga-edozigharị ihe niile.

11Mgbe Kraịst bịara dị ka onyeisi nchụaja nke ezi ihe ahụ dị ugbu a, site nʼụlọ ikwu dị ukwuu zuruoke nke a na-ejighị aka mee, nke na-esoghị nʼihe e kere eke,

12o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi.

13Ma ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oke ehi dị iche iche, ya na ntụ nwa agbọghọ ehi, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ido ha nsọ, meekwa ka ha dị ọcha nʼelu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.