14Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ.
15Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ.
16Ọ bụrụ na mmadụ ekee ekpe mgbe ọ nọ ndụ, a na-ebu ụzọ achọpụta ma onye kere ekpe ahụ ọ nwụọla.
17Ekpe na-amalite ịdị ire mgbe onye kere ekpe ahụ nwụrụ, nʼihi na ihe mmadụ kere nʼekpe anaghị adị ire mgbe onye kere ya ka dị ndụ.
18Ọ bụ nke a mere ọ bụladị ọgbụgba ndụ ochie ahụ jiri bụrụ ihe na-adịghị ire ruokwa mgbe ọbara batara na ya.