21Nʼotu aka ahụ, o fesakwara ọbara ahụ nʼelu ụlọ ikwu na nʼelu ihe niile dị nʼụlọ ikwu, bụ ihe niile e ji efe ofufe.
22Nʼikwu eziokwu, dịka iwu si dị, ọ dịghị ihe ọbụla nke a na-adịghị eji ọbara edo ọcha. Ọ bụrụ na a wụsịghị ọbara, mgbaghara mmehie adịghị.
23O kwesiri ka e si otu a mee ka ihe ndị a yiri ihe ndị dị nʼeluigwe dị ọcha, ma ihe ndị dị nʼeluigwe nʼonwe ha kwesiri ka e nye ha aja dị mma karịa.
24Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke.
25Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ.