25Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ.
26Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja.
27Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,
28otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.