Ndị Hibru 9

Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.

Hebrews 9:5 (UKJV) And over it the cherubims of glory shadowing the mercy seat; of which we cannot now speak particularly.

3Nʼazụ akwa mgbochi nke abụọ ka e nwere ọnụụlọ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ,

4nke nwere ebe ịchụ aja mgbaisiọma e ji ọlaedo wuo, na igbe ọgbụgba ndụ ahụ nke e jiri ọlaedo machie ahụ ya niile. Ihe dị nʼime ite ahụ bụ mánà na mkpanaka Erọn nke ahụ puputara ahịhịa, ya na mbadamba nkume e dekwasịrị iwu ọgbụgba ndụ.

5Ihe dị nʼelu igbe a bụ cherubim nke ebube ya, na-ekpuchite oche amara ahụ. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe niile ndị a nʼozuzu oke ugbu a.

6Mgbe e doro ihe niile ndị a nʼusoro, onye nchụaja na-abata mgbe ọbụla nʼime ọnụụlọ nke mbụ nke ụlọ ikwu a. Nʼebe a ka ọ na-arụ ọrụ o ketara ịrụ.

7Ma ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-abanye nʼime ọnụụlọ nsọ nke abụọ, naanị otu ugboro nʼafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nʼebe ahụ, iji chụọ aja maka onwe ya na nʼihi mmehie ndị mmadụ mere na-amaghị ama.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.