Hosiya 1

Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.”

Hosea 1:2 (UKJV) The beginning of the word of the LORD by Hosea. And the LORD said to Hosea, Go, take unto you a wife of whoredoms and children of whoredoms: for the land has committed great whoredom, departing from the LORD.

1Okwu Onyenwe anyị nke bịakwutere Hosiya nwa Beiri nʼoge Uzaya, na Jotam, na Ehaz, na Hezekaya, bụ ndị eze Juda, na nʼoge Jeroboam nwa Jehoash bụ eze nʼIzrel.

2Na mmalite okwu Onyenwe anyị site nʼọnụ Hosiya, Onyenwe anyị gwara Hosiya sị, “Gaa lụtara onwe gị nwanyị na-akwa iko na ụmụ amụtara nʼịkwa iko, nʼihi na dịka nwanyị alụrụ alụ nʼakwa iko, ala a na-akwa iko nke ukwu site nʼịgbahapụ Onyenwe anyị.”

3Ya mere, ọ gara lụọ Goma nwa Diblaim, onye tụụrụ ime mụọra ya nwa nwoke.

4Onyenwe anyị gwara ya, “Aha ị ga-agụ nwantakịrị ahụ bụ Jezril. Nʼihi na tupu nwa oge nta agafee, aga m ata ezinaụlọ Jehu ahụhụ nʼihi ọbara ọ wụsiri na Jezril. Aga m eme ka alaeze nke ụlọ Izrel kwụsị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.